'A na m ahapụ akwụkwọ iji chute ezigbo mmiri'

Ọhịa Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Macilau na-ese foto ọtụtụ ihe

Mario Macilau dị afọ iri abụọ na atọ (23) oge o gbanwere ekwenti nne ya iji gote ose foto Nikon. Ise foto abughịrị ihe ọhụrụ maka na o bidoro oge ọdị afọ iri na anọ sewe foto gbasara ndụ ndi obodo ha bụ Maputo dị n'isi obodo Mozambique.

O sela ọtụtụ ihe ndị ọọ bido n'ụmụaka nọ n'okporo ụzọ nakwa ndị ọrụ simenti na mba ahụ. Ugbu a, o burula ose foto ya che ebe okwu mmiri dị.

Foto ndị a e sere na ngwụcha afọ 2017 sitere na-enyemaka ndị otu a na-akpọ WaterAid maka ọrụ ozi ha na-arụ rue ngwụcha ọnwa a bụ Jenuwarị. Bido ugbu a rue afọ atọ na-abịa, Macilau ga-edekọ mgbanwe mere n'obodo ndị dị n'akụkụ Cuamba dị na Mozambique dịka ha nwetara ezigbo mmiri nakwa ebe mkposi.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka Maputo
Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụkwụ ha na-egosi udi njem ha mere ichuta mmiri
Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Josefina na Eudicia na-aga akwụkwọ nanị otu ụbọchị maka mmiri

Josefina na Eudicia, ha abụọ dị afọ iri na abụọ, ọ na-ahapụ akwụkwọ ihe ruru ugbo anọ n'izu iji chuo mmiri.

Ha na-eji ụkwụ aga Rio Naranja, iyi na-asọpụta n'osimiri Muassi, nke bụ isi ebe obodo Muassi na-enweta mmiri.

Iyi ahụ ahụ anaghị asọpụ asọpụ, nke a kpatara na mmiri ha na-echute na-acha ka mmiri ara dịka Macilau siri kwuo

WaterAid kwuru na otu nime nwatakịrị nọ n'ụwa enweghi ezigbo mmiri n'akụkọ ụlọ ha ebe ha enweghikwa ezi ebe mkposi.

kwa ụbọchị, ihe ruru ụmụaka narị asatọ na-erughi afọ ise na-anwụ site n'ọya afọ ọsịsa nke ajọ mmiri na gburugburu na adịghị ọcha na-akpata.

Image copyright WaterAid/Mario Macilau
Nkenke aha onyonyo Ha na-arị ugwu iji chute mmiri
Image copyright WaterAid/Mario Maclaụ
Nkenke aha onyonyo Inweta ezigbo mmiri bụ nnukwu nsogbu na mpaghara Afrịka
Image copyright WaterAid/Mario Macilau
Nkenke aha onyonyo Ụlọ mmiri ozuzo kwaturu
Image copyright WaterAid/Mario Macilau
Nkenke aha onyonyo Ihe ndị na-asọba na mmiri

N'oge mmiri ozuzo, mmiri Lurio na-adị njọ nke ukwu n'ihi na atịtị ndị dị na gburgburu ebe mmiri ahụ dị ga-asanye na ya kpatara na-agahị anụ ya anụ.

N'obodo M'mele, mmiri ozuzo kwaturu otu ụlọ aja ụpa afọ atọ gara aga.

Onye isi ndị obodo ahụ kwuru na ndị mmadụ na-akwapụ n'obodo ahụ maka nsogbu mmiri ahụ.

Image copyright WaterAid/Mario Macilau
Nkenke aha onyonyo Foto onye oru ugbo kara nka ajo mmiri wuru
Image copyright WaterAid/Mario Macilau
Nkenke aha onyonyo Angelina na nwa ya nwaanyi Irene na sosona Masel
Image copyright WaterAid/Mario Macilau
Nkenke aha onyonyo Elisa Piassone na Zaida na-aga n'ụzọ dị n'etiti M'mele na Kimar dịka ha na-ebuga ntụ ọka

Isiokwu Ndị Emetụtara