Ọtụtụ mmadụ aṅwụọla n'ọkụ ọgbụgba na Lagos steeti

Ụlọ ọrụ Second Coming Oil and Gas mgbe ọkụ ahụ rechara ya
Nkenke aha onyonyo Ụlọ ọrụ Second Coming Oil and Gas mgbe ọkụ ahụ rechara ya

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịhe mberede na Lagos bụ LASEMA agwala ndị nta akụkọ BBC na ihe ruru mmadụ abụọ aṅwụọla, ebe mmadụ asatọ merụrụ ahụ dị ichiiche n'ihi ọkụ ọgbụgba mgbe ọdọ mmanụ gas gbawara n´ụtụtụ a.

Ụlọ ọrụ ahụ kwuru na ịhe eji adọ mmanụ gas dị lịta puku iri atọ na atọ (33,000 ltr) gbawara ma nwuru ọkụ, ebe ọtụtụ tankị ndị ọzọ gbawara ka ogbunigwe na ụlọ ọrụ Second Coming Oil and Gas nke dị na mpaghara Lagos anakpọ Magodo.

Onyeisi ndị LASEMA bụ Adesina Tiamiyu gwara ndị BBC na-eburu ndị ihe a metụtara gawa n'ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe mberede na Lagos maka inye ha ọgwụgwọ.

Onye isi ndị ụlọ ọrụ Fire Service na Lagos bụ Rasaq Fadipe kwe nyere na nke a, kwuo na otu onye ndị ụlọ ọrụ ha na ṅwụnyụ ọkụ merụrụna ọ na-enweta ọgwụgwọ ugbu a.

Nkenke aha onyonyo Ndị ụlọ ọrụ Fire Service bịara ịgbanyụ ọkụ

Onye hụrụ ka ihe a jiri mee kwuru na ihe ochere butere ọkụ ọgbụgba a bụ mgbe mmanụ gas dịna ọdọ mmanụ ahụ na-ehifu ehifu bara ọku.

Adesina kwuru na ebe niile adala jụụ, dịka ndị ụlọ ọrụ ha echekwala ma chụpụkwa ndị mmadụ ebe ahụ. kwukwa na-aga eme ezigbo nyocha gbasara ọkụ ọgbụgba ahụ.

Ọzọ mekwara na Badagry:

Image copyright Afolabi Aigoro
Nkenke aha onyonyo Ọzọ mekwara na Badagry
Image copyright Afolabi Aigoro
Nkenke aha onyonyo Ọzọ mekwara na Badagry

Na nke a, ọ ebe ana eregas na Iluda Road, Ajara Vetho dị na Badagry na Lagos.

Onye hụrụ mgbe ịhe a mere sị na ana eche na ihe kpatara ọku a bu ekom ọkụ na ene ọgbọ gas na ụlọ ebụsara ha.

Onye isi ndị na hu maka ịhe banyere ọkụ na Lagos, Rasaq Fadipe kwetere na ịhe mberede a mere, mana o sịkwa na ndị zara oku mgbe ha nụrụ maka ihe mberede a.

"Ọlụ ọrụ anyị na Badagry nụrụ oku a na elekere ịtoolu taa ma zakwa oku a osịsọ. Mma kwu maka ndị ṅwụrụ maka na ekwetegeghim ọgụ one ṅwụrụ." o kwu kwara.

Onye hụrụ mgbe ịhe a mere bụ Afolabi Aigoro gwara BBC na ọkụ a na mgbawa ọgbọ gas sote ya mere na ụlọ ọrụ onye na arụ ọrụ mmezị ahụ ụgbọ ala.

Ọ kọwara na ndị na agahe agahe so na ndị ṅwụrụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara