Benue a kagbuola ịjị otu afọ efe Naịjirịa a na-kpo NYSC

Ndị mmadụ na ekwu na ha chọrọ ka akwụsị NYSC na ebe nsogbu dị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị mmadụ na ekwu na ha chọrọ ka akwụsị NYSC na ebe nsogbu dị

Otu Gọọmenti etiti guzobere na achikaọta ịjị otu afọ efe ala nna akagbuola agbata nke bụ n'ihi nsogbu a na-ada na ya bụ obodo Benue.

Ha kwuru na ụbọchị ọhụrụ a ga-eji mee mmemme bụ nke ha ga-ekwupụta ma ekwekorita na ya.

Gọọmenti etịtị gwakwara ndị niile nke a metụtara ka ha nwee ndidi chere obere oge ka a hazie otu ha ga-esi nweta ya bụ ọzụzụ na enweghi nsogbu ọbụla.

Cheta na ndị ọchụ ehi na ndị ọkọ ugbo na-enwe nghọtaghịonwe na Benue, nke butere igbu mmadụ na imebisi ihe ndị mmadụ na steetị ahụ.

Anyị ga-ewetakwuru ụnụ akụkọ maka ihe a mgbe anyị nwetela ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara