Lassa Fever: Ihe ị ga-eme were gbochie ya

Oke ndi na-ebute lasa fiva ka nku na Naijiria Image copyright Matthieu Aubry
Nkenke aha onyonyo Oke ndi na-ebute lasa fiva ka nku na Naijiria

Ọriị lasa fiva nke oke na-ebugharị egbuola mmadụ atọ n'Ebonyị steetị ụnyaa na taa.

Otu onye ọrụ ahụike bụ Dr. Azụọgụ Benedict kwuru nke a oge ọ gwara BBC Igbo okwu.

Mmadụ atọ ahụ nwụrụ bụ ndị ọrụ ahụike na ụlọ ọgwụ ukwu dị na Abakaliki, Ebonyi steeti, mmadụ abụọ bụ dọkinta ebe otu onye bụ nọsụ nwoke.

Dr. Azụọgụ gwara BBC na ha na-ele anya na ndị ahụ nwụrụ butere ọrịa ahụ site n'ahụ ndị ha na-eleta n'ụlọ ọgwụ.

"Ụfọdụ oge ndị dọkịnta na-achọ inyocha ndị ọrịa, ha agaghị ama ihe na-arịa ha ma ọ bụ ọrịa na-efe efe, ha na-esi etu a ebute ọrịa" - Dr. Azụọgụ kwuru.

Dr. Azụọgụ kwukwara - "Anyị ekwuola ka ndị dọkịnta na-emeo ọrịa niile omume ka lasa fiva ma kpuchie onwe ha nke ọma"

O nyere ndụmọdụ ka ndị na-ehicha ụlọọgwụ tinye uchu ma jiri ihe ndị na-egbu nje na-eme ka ụlọ ọgwụ na-adị ọcha oge niile.

Mana o kwuru na ha nwere mmetụta na enweghi ezie ebe a na-akpoga ndị nwere lassa fiva

N'aka nke ọzọ, o kwuru etu ndị mmadụ ga-esi gbochie ya bụ ọrịa lasa fiva:

Ụzọ mgbochi lasa fiva

  1. Ndị ọrụ ahụike kwuru na ihe na-ebute lasa fiva bụ oke, site na mmamịrị ma ọ bụ nsị ya, ya mere:
  2. Debe gburugburu gị ọcha, ekwela ka oke bịa nso na be gị
  3. Erila ihe ọbụla oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
  4. Were ihe na-egbu nje hichaa gburugburu ebe oke nyụrụ nsị ma ọ bụ mmamịrị
  5. Onye ọbụla ahụ ọkụ na-eme, kpọrọ ya ga n'ụlọ ọgwụ
  6. Kpuchi onwe oge ị na-emetu onye ahụ na-adịghị aka
  7. Mara etu isi ekwe ndị mmadụ aka
  8. Mechie ebe niile nwere ohere oke nwere ike isi bata n'ụlọ gị
  9. Ahụ rịa gị, ga n'ụlọ ọgwụ
  10. Jiri ncha na mmiri na agba agba kwọcha aka gị oge niile

Isiokwu Ndị Emetụtara