Adama Barrow: Buhari biri ọgbaghara ndị Gambia

Barrow, Buhari Image copyright @Mbuhari
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ nke mbụ Barrow na abia Naijiria kemgbe Ọ banyere na ọchịchị na afọ 2017

Ọgbakọ onye na-achị Gambia bụ Adama Barrow na Muhammadu Buhari mere taa a bịala n'isi njedebe.

Barrow kwuru na ya bịara ikele Buhari maka enyemaka o nyere ndị Gambia oge ha mere nchịgharị na gọọmenti ha n'afọ 2017.

Ndị isi ala abụọ ahụ nwere ọgbakọ n'ụlọ ọchịchị Aso Rock n'Abuja.

Ụlọ ọrụ onye isi ala kwuru site na twitter na ọgbakọ ahụ gara nke ọma.

Buhari kwuru na nkwado Naịjirịa kwadoro Gambia oge ha nọ na nsogbu bụ iji kwalite mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na obodo ahụ, ebe o kwere nkwa na nkwado ahụ ga na-aga n'ihu.

Ndị otu mba mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka họpụtara Buhari n'afọ 2017 inye aka wepụ onye chịburu Gambia bụ Yahaya Bello oge o kweghị isi n'ọchịchị pụọ.

Barrow kwuru na Buhari gbara mbọ nke ukwu hụ na Bello pụrụ n'ọchịchị ma zigakwa ndị agha Naịjirịa na Gambia ịhụ na ọgbaghara adaghị n'obodo ahụ.

Nke a bụ mbụ Barrow na-abịa Naịjirịa kemgbe o were ọchịchị na Gambia n'afọ 2017.

Isiokwu Ndị Emetụtara