Agaghị eji isi Mkhitaryan gbanwe nke Sanchez

Mkhitaryan Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mkhitaryan agbara ndị United asọmpị ugboro iri abụọ na abụọ

Otu onye enyi onye na gbara Manchester United bọọlụ bụ Mkhitaryan agwala ndị ntaakụkọ BBC na onweghị nkwekọrịta ọbụla maka iji isi Mkhitaryan gbanweta nke Sanchez.

Ọ bụ eziokwu na Sanchez ekwela igbara Manchester United bọọlụ, mana otu Arsenal na otu United agaghị ekwe ma ọ bụrụ na Mkhitaryan agafetaghị.

Nwafọ mba Almenia gbara afọ iri abụọ na asatọ ka na- atụle ma ọ ga-aga njem a, ebe ọdịghị ya ngwa ngwa ime mkpebi gbasara ya.

Otu United meriri otu Arsenal n'ịzụta Mkhitaryan site na Borussia Dortmund na ọnụ egọ dị nderi pounds iri abụọ na isii n'afọ 2016.

Ọ bụghị obi nwa amadị a ịpụ na Old Trafford mana nhọtaghie dị n'etiti ya na onye-isi ha bụ Jose Mourinho gbasara ụzọ o si agba bọọlụ butere echiche ọpụpụ ya, ebe oge ọnọdụ ya ka na-aga n'ihu rue n'afọ 2020.

Ndị otu Dortmund ebe ọ gbaburu bọọlụ anaghị eche echiche ịzụtaghachị ya.