Niger Delta Avenja: Anyị ga-amalite igosi iwe na ọnụma mgbe adịghị anya

Niger Delta Avengers Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Niger Delta Avengers chiri ochi ka gọọmentị Naịjịrịa tee nkwucha, maa chee aka ghọrọ ha mgbe adighị anya

Ndị otu Niger Delta Avenja e kwuoola na ha ga-amalite ịgbari okporo mmanụ agbịdị mgbe adịghị anya.

Ya bụ otu akpara mkpamkpa mere ka akụ na ụba Naịjirịa maa afọ n'ala na 2016.

Mgbe ha kpara ike a ka mmanụ agbịdị ana emepụta na Naịjirịa daruru ala kemgbe afọ iri atọ.

Ndị otua tụkwara ọnụ sị na anya ahụbeghi, ntị anụbeghị nke ọ na-abata n'obi ndị mmadụ udị mmkpamkpa ha ga-akpa na nke a.

Ha sịkwa na ọ bụ "n'ebe obodo a na-amịpụta mmanụ agbịdị nke dị n'ime oshimiri ka ha na-edo".

Igwe e ji amị mmanụ ndị dị na Bonga Platform, Agbami, EA Field, Brittania-U Field nakwa Akpo Field.

N'afọ 2016 Niger Delta Avengers gbariri igwe mmanụ nke dị na oshimiri Forcados.

Ntị jụrụ ndị mmadụ oyi kamgbe 2017 n'aka ndị ọkpa ike a.

Na website ha, otu a kwuru na ọgbaaghara nke na-ada ugbu a na Naịjirịa bụ mgbe kwesiri iji gosịpụta iwe ha n'uju ịme ka gọọmentị megharịa ka esi achị obodo a nke a na-akpọ 'restructuring' n'ọnụ bekee.

Isiokwu Ndị Emetụtara