Victor Umeh ebidola ọrụ dịka Sinatọ Anambara Sentralụ

Victor Umeh Image copyright INEC official Facebook page
Nkenke aha onyonyo Victor Umeh, onye meriri ntuliaka Sineti ndị Anambra ebe mpaghara Etiti nke e mere n'ụbọchị 16 Jenụwarị, 2018

Onye bụbu onye-isi pati a na-akpọ All Progressive Grand Alliance (APGA) bụ Victor Umeh anarala ikike ka onye na-anọchite anya Anambra Sentralụ na ụlọ ome-iwu ukwu na Abuja.

Victor Umeh meriri na mbinye aka e mere n' Anambra Steetị na Satọde nke izu ụka gara aga.

Onye na-achị Anambra Steetị bụ Willie Obianọ nọ n'ụlọ ome-iwu ukwu n' Abuja mgbe e chere Victor Umeh iyi ọrụ nke mere ya onye otu ndị ome-iwu na Naijirịa.

Ụlọ ikpe mkpekwa nke a na-akpọ Appeal Court chụpụrụ onye nọbu na ọkwa a bụ Uche Ekwunife nke Peoples Democratic Party (PDP), na onwa Decemba 2015.

Ọ bụ Umeh wetara ikpe ejị maka ya chụọ Ekwunife, mana Ekwunife na-ekwu na ya anabatala mmeri o meriri ya ugbu a.

  • Anambra Sentralụ: 'Ekwenyela m mpụtara ntulịaka' -Uche Ekwunife
  • INEC: Victor Umeh a natala asambodo ikike ya
  • Mbinye Aka Anambra Central Senatorial District

Ụlọ ikpe ahụ nyere iwu ka e megharia mbinye aka e jiri nye Ekwunife ikike.

A tụrụ votụ na local government asaa: Njikoka, Awka-North, Idemili-South, Dunukofia, Awka-South, Anaocha na Idemili-North.