"Onweghị ihe gosiri na ọ bụ ndị agha ji Kanụ"

Nnamdi kanu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A maghị ebe Nnamdi kanu kamgbe ọnwa September afọ gara aga oge ndị agha wakporo be ya na Afara Ukwu Abia steeti.

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akagbuola akwụkwọ, ndị ezi na ụlọ Nnamdị Kanụ na ọkaiwu ya gbara ịjị rịọ ka ọ manye onye isi agha ala Najiria bụ Tukur Buratai ka kpụpụta Kanu ebe ha dowere ya.

Jọstis Binta Nyako, bụ ọka-ikpe biri ikpe ahụ kwuru na o weghị anya etu ọnye a sị na a na-achọ achọ sịrị bụrụ onye gbara akwụkwọ ahụ.

Ogara na ihu kwuo na ha gara agba akwụkwọ ahụ n' aha Kanụ, kama ị sị na ọ bụ Kanụ tinyere ya.

A na- achọ Lani achọ kehbe ọnwa Setemba gbata Ndị otu Indigenous People of Biafra bụ IPOB n'aha ịchafụ ekwuola na gọọmenti etiti na ndị agha soja bụ ndị ji onye isi ha bụ Nnamdi Kanu.

Onye nkwuchite ọnụ ha bụ Emma Powerful kwuru nke a oge ọ gwara BBC Igbo okwu taa.

Ọ kwuru na ndị gọomenti ji ya mana ha amaghị ebe ha ji ya.

N'okwu ya - "Kedụ ka ha ga-esi kweta na ha ji ya, ha mara na nwoke ahụ bụ nsogbu dịrị Naịjirịa, ha chọrọ ikpuchi ya ọnụ".

"Ha agwaghị anyị ebe ha debere ya, anyị abụghị gọọment, anyị abụghị DSS ma ọ bụ soja, ha bụ ndị mara ebe ha ji ya mana ha ga-akpọpụta ya, ọkwa iwu"

"Papa ya ma mama ya, onweghi onye mara maka ha, oge ha gara ebe ahụ, agbara gwogwo ebe ahụ, ị ga ebe ahụ, ị ga-ahụ ihe ndị agha mere ebe ahụ".

N'aka nke ọzọ ndị otu IPOB mere njegharị n'aba n'ụbọchị 20 Jenuwarị ime mkpesa gbasara ikpe ọka ikpe Abdul Kafarati kpebiri n'izuka gara aga na IPOB bụ otu na-eyi ọha egwu.

Onye nkwuchite ọnụ ndị IPOB Emma Powerful gwara BBC Igbo na njegharị ahụ bụkwa iji cheta ndị ụmụ Biafra ndị agha Naịjirịa gburu n'Igweọcha dị na state Rivers ụbọchị 20 Jenuwarị, 2017.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọkọlotọ ndị Biafra

Ụlọ ikpe kpebiri n'izu ụka gara aga na IPOB bụ otu na eyi ọha egwu dịka ndị Boko Haram.

IPOB kwuru na ọka ikpe ahụ ekweghi enye ha akwụkwọ o jiri kpee ya bụ ikpe nagbanyeghi mbọ niile ha gbara iji nweta ya.

Ke ịhe okwu a pụtara?

Otu IPOB site n'akwụkwọ ha dere nke onye nkwuchite ọnụ ha bụ Emma Powerful binyere aka na ya kwuru na ọ gbagojuru ha anya ihe kpatara ọka ikpe ahụ jiri na-egbu oge iweputa akwụkwọ ikpe ahụ.

Powerful kwuru na ha gwara ọka ikpe ahụ na ha chọrọ igba akwụkwọ ka e kpegharịa ya otu ụbọchị o kpere ikpe nke ya.

O kwuru na "Ihe a so n'ụzọ a chọrọ iji dọta ndị mpaghara ọdịda anyanwụ na abụghị ndị na-akpọ isi ala n'ike".

Ha kwuru na izu a na-agba emegide ha agaghị akwụsị ha ime ma kwuo na ha chọrọ ka ihe niile bụ ihe gọọmenti etiti wepụtara eji kpee ha ikpe bụrụ ihe ga-eru ha aka n'ụzọ iwu ka ha nwee ike ịga ụlọ ikpe nkpekwa etu ha si chọ.

Cheta na gọọmenti etiti kpọrọ IPOB otu na-eyi ọha egwu n'afọ gara aga oge ha bidoro njegharị iwe na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa maka ka e kewa Naịjirịa nye ha ala nke ha bụ Biafra.

Gọọmenti etiti zigara ndị agha ndị ji egbe na ngwọagha dị ichiche wee kwụsị ha.

Kamgbe ihe ahụ mere, amaghị ebe onye isi ha bụ Nnamdi Kanu nọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara