Ndị ọrụ gọọmentị Amerịka emechiela ka ọrụ na-ebido

Statue of Liberty Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Statue Liberty so na ebe mechiri, mana onye na achị New York na akọwa na ya ga eji ego steeti ya kụọ ndị mmadụ ụgwọ onwa

Ihe ruru narị na puku ndị ọrụ gọọmentị etiti agaghị abịanwu ọrụ na Mọnde, ka ndị Sineti mba Amerịka na-adọlị ịkwụsị mmechi ụlọ ọrụ gọọmentị.

Agaghị akwụ ụfọdụ ụgwọ ruo oge ha ga-enwe mkpebi.

Ọgbakọ ndị sineti nwere n'ụbọchị ụka amịtaghị mkpụrụ nkwekọrịta ọbụla n'etiti ndị Democrats na ndị Republicans, ebe mbịarambịara bụ otu n'ime okwu akpụ n'ọnụ.

Ọrụ ndị dị oke mkpa ga-narụ mana ọmetụtara ụfọdụ ndị ama-ama dị ka Statue of Liberty.

E mechiri ya bụ ihe ncheta akpụrụakpụ n'ụbọchị ụka, mana gọvanọ New York bụ Andrew Cuomo, kwuru sị na ọ ga-etinye aka n'ime akpa ego steeti ya were kwụọ ndị mmadụ ụgwọ ọrụ, ma meghekwaa ya bụ ebe nlegharị anya ama ama.

Ha nwere ọgbatughie.

Gịnị kpatara gọọmentị ji mechie?

N'etiti abalị Fraịde, ndị omeiwu ekwenyeghị na iwu nchekwa ego. Iwu ahụ esonyeghi na atụmatụ nke ego 2018 niile, mana ọ gaara-eme ka ihe na-aga ọfụma ruo etiti ọnwa Febrụwarị.

Ndị Democrats ekweghị akwụdo na mkpebi nwaoge ha kpebiri, ruo oge emere ihe gbasara ucheobi ha maka ndị mbịarambịara.

Mgbalị niile ha gbalịrị iji hụ na ha nwere nkwekọrịta tupu izu ọrụ ọhụrụ eruo, dara na Sunde.

Eyigharịrị mbinyeaka iji akwụsị mmechi ọrụ ruo etiti ehihie Mọnde, nke pụtara na ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị etiti agaghị emepe, ga-eme ka mmechi ọrụ a banye ụbọchị atọ.

N'okpuru iwu Sineti, iwu a kwesịrị inwete mbinyeaka iri isii n'ime mmadụ otu narị nọ na ụlọiwu ahụ.

Trump tinyere ọnụ n'okwu a na Twitter.

Isiokwu Ndị Emetụtara