'A ghọrọm nwụnye mmadụ na mkpụrụ ụbọchị isii'

Sophy Ijọma na di ya Chịdịmma Amedu Image copyright Chidimma Amedu
Nkenke aha onyonyo Sophy Ijọma na di ya Chịdịmma Amedu hụtara onwe ha na Facebook

Mmadụ ole na achota dị m'ọbụ nwụnye na "social media"? Mmadụ ole na-achọta di m'ọbụ nwunye ma lụ kwa ya n'ime ụbọchị isii?

Nke a bụ kwa akụkọ mere eme n'etiti otu nwanyị a na-akpọ Sophy Ijoma na Chidimma Amedụ hụtara onwe ha na Facebook.

Ọ bụ mgbe Disemba gbara ụbochị iri atọ n'otu ka Chidimma tinyere ozi o ji achọ nwunye Facebook.

Nwa agbọghọ a na-akpọ Sophy zakwara ya ozi a si Chidimma zitere ya ozi ka ha jiri ga iru.

Image copyright Chidimma Amedu
Nkenke aha onyonyo Sophy sị na ọ hụrụ dị ya n'anya ozigbo ọ hụrụ ya

Chidimma sị na ha kwuru okwu n'ekwenti tupu ya esi Abuja gawa Enugu ị ga hụrụ nwata nwanyị a.

Ọ sị kwa na otu ụbọchị ahụ orutere Enugu, ka o nwetara nkwado nke ndi be nwannyi na kwa ndi nke ya maka iga niru ịme omenala ndị ọzọ.

"ije a bidoro dịka egwuregwu maka na ozi m gbasara n'elụ igwe okwu Facebook bụ egwuregwu na mbụ," dika Chidimma sị kwuo.

Na aka ya, Sophy si na ha bụ ihe turu ya na anya.

"Ọjọ na atụm mgbe anyi gara ịhụ nnem, maka anaghịm ma o ga akwado kam lụọ nwoke m hụrụ na Facebook," Sophy gwara anyị.

Image copyright Chidimma Amedu
Nkenke aha onyonyo Ezi n'ụlọ ha abụọ nyere ha ngozi na kwado maka mkpebị ha mere ịlụ dị na nwunye

Isiokwu Ndị Emetụtara