Mmechi ọrụ na Amerịka ga-ebị dịka sineti nwere nkwekọrịta

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionSchumer na White House na ata onwe ha ụta maka mmechị ọrụ gọọmentị

Mmechi gọọmenti mba US ga-abị n'isi njedebe dịka ndị otu pati Rịpọblikan na Demokrat kwadorola bọjeti ọhụrụ ga-edu ha nwantịtịoge.

Sinetọ Chuck Schumer kwuru na ndị otu pati Demọkrat ga-akwado akwụkwọ iwu ego ahụ maọbụrụ na ndị otu pati Rịpọblikan tinye uchu na ichekwa ndị mbịarabịara, ka a ghara ịchụpụ ha.

Ndị Demokrat jụbụrụ ikwado akwụkwọ iwu ahụ rue mgbe ha nwetara nchekwa maka ndị nọ n'okpuru ahụike Obama.

Schumer kwuru na mmechi ahụ ha mechiri mkpụrụ ụbọchị atọ ga-ebe n'oge olenaole.

"Anyị ga-ebinye aka taa iji mepee gọọmenti ka anyị bido ịkparịta ụka gbasara nkwekọrịa mba ụwa", Schumer kwuru.

Ọkatọrọ onyeisiala Donald Trump n'ihi na o nwetaghịnwu nkwekọrịa n'etiti ndị pati dị icheiche ebe ọ sị na ya na ya ekwubghi kamgbe ụbọchị 19 Jenuwarị tupu mmechi ahụ.