Kedu ka Sanchez sịrị baa Manchester United?

Alexis Sanchez Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Alexis Sanchez na-enye goolu nke ọma

Onye egwuregwu bọọlụ Alexis Sanchez e binyeela aka na akwụkwọ ndị otu Manchester United.

Manchester United jị nde euro ịrị na anọ (E14m) zụtara Sanchez n'aka ndị Arsenal.

Otu Manchester City kwusịrị mmasị ha n'ebe Sanchez nọ n'ịzụka nke gara aga makana ha che na nnabata Sanchez ga-emetụta emume ndị otu egwuregwu ha.

Manchester United ekwuola na Sanchez ga-eyi uwe akara asaa.

Sanchez ga-esokwa na asọmpị ndi Red Devils na otu di iche iche na English premier League akpọrọ FA cup ga-agba n'ubọchị ịrị na isii na ọnwa Januwari.

N'akụkọ yịrị ibeya Henrikh Mkhitaryan a baala otu Arsenal.

Sanchez na Mkhitaryan na ọnụ ogwụgwụ 4

  • Ka mgbe ọ bara Arsenal na afọ 2014, Sanchez enyela goolu ruru iri isi. Nani Romelu Lukaku, Sergio Aguero na Harry Kane bụ ndị ka ya nye goolu.
  • Na asọmpi ya niile Sanchez nyere goolu iri asatọ kari ndi eguregwu ọzọ na otu Arsenal.
  • Emerigo Arsenal ugboro atọ ka mgbe Sanchez kwụsịrị ịgbaru ha bọọlu.
  • Mkhitaryan agbaala ndị Manchester United asọmpị ru iri isi na atọ, nyekwa goolu iri na atọ.