Manchester United ka bụ igwe kacha ebiri egwuregwu bọọlụ ego

Manchester United kwụsịrị oge bọọlụ nke Premier League 2016/2017 n'ọkwa nke isii Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Manchester United kwụsịrị oge bọọlụ nke Premier League 2016/2017 n'ọkwa nke isii

Manchester United bụ nke mbụ n'ọkwa ndị otu iri abụọ kachasị nwee ego na egwuregwu bọọlụ n'ụwa, n'ime afọ abụọ a na-eso onwe ha, ma bụrụkwa ugboro iri ha ga-eme ya, dịka Deloitte kwuru.

Ndị njikọ nke ego ndị egwuregwu bọọlụ (Football Money League) chọpụtara na n'ime afọ 2016-17, ntụkọta ego Klụb iri abụọ ahụ rịrị ruo pasenti isii nke pụtara Euro ijeri asaa na nde itoolu (€7.9bn), mekarịsịa afọ ndị gara-aga..

Real Madrid nọbụ n'elu n'ọkwa ahụ ruo afọ iri na otu, gbara n'ọkwa nke abụọ ebe Barcelona gbara na nke atọ.

Otu iri si na klọb Premier League England so n'ọkwa iri abụọ nke mbụ ndị mekarịchara ọfụma. Ọnụ ọgụgụ ha si na iri na abụọ gbagoruo iri na anọ.

Ihe ndepụta a na-egosi nanị ego ole ha kpatara, mana ọ naghị etinye ụgwọ ha ji n'uche.

N'afọ a, azọrọ ọkwa nke mbụ a azọ ọfụma, mere Manchester United ji were nanị Euro otu nde na puku narị asaa were gafee Real Madrid.

Otu league ise bukarichara

Euro nde narị isii na iri asaa na isii (€676m) nke Manchester United kpatara, ritere uru Euro iri anọ na anọ na ise (€44.5m) n'aka UEFA ka ha bulichara iko nke Europa League ka ha na Ajax sọrọ mpi.

Ndị Deloitte kwuru sị na ego a bụ "ihe dị mkpa eji kpebie na ha ga-aga n'ihu karịa Real Madrid na Barcelona".

Image copyright JAVIER SORIANO
Nkenke aha onyonyo Ronaldo na Messi na-agbara klọb abụọ so na ndị nọbu n'ọkwa ndị kacha akpata ego bụ Real Mdrid na Barcelona

Bayern Munich na Manchester City mechara n'ọkwa nke ise, bụ ọkwa ha n'afọ gara aga.

Arsenal, Paris St-Germain, Chelsea, Liverpool na Juventus nọ n'ọkwa nke isii ruo nke iri. Tottenham gbara n'ọkwa nke iri na otu, Leicester City ọkwa nke iri na anọ, West Ham nke iri na asaa, Southampton nke iri na asatọ na Everton gbara nke iri abụọ.

Klọb iri abụọ anọchitere anya si na "ise kachasị ibu" na league Europe, ebe Italy, Germany na Spain wepụtara klọb atọ ma France ewepụta otu.

Ndị njikọ nke ego ndị egwuregwu bọọlụ dịka Delọitte wepụtara

  1. Manchester United: €676.3m
  2. Real Madrid: €674.6m
  3. Barcelona: €648.3m
  4. Bayern Munich: €587.8m
  5. Manchester City: €527.7m
  6. Arsenal: €487.6m
  7. Paris Saint Germain: €486.2m
  8. Chelsea: €428m
  9. Liverpool: €424.2m
  10. Juventus: €405.7m