Lassa fiva agbasawala ọzọ na Naịjirịa

Lassa fever na Nigeria Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọrịa lasa fiva (Lassa Fever) dịka ka ọ bụ ndị ọrụ ahụike ka ọchere aka mgba

Otu Dokinta ndị Kogi Steeti akpọrọ Victor Idowu agbabirila nwụọ n'aka ọrịa lasa fiva (Lassa Fever).

Otu jikọtara ndị dibịa oyibo bụ Naịjirịa Medical Association (NMA) kwuru na-onye otu ha nwụrụ n'ụlọ ọgwụ Irrua Specialists Hospital dị n'Edo Steeti n'ụbọchị Eke 22 Jenụwarị, 2018.

Ndị otu a chọpụtara na Idowu butere ọria n'ihu ọrụ na mkpụrụ ụbọchị iri na itolụ nke ọnwa Jenụwarị.

Ode akwụkwọ ndị NMA na Kogi steeti bụ Zubai Kabir sị na "Ihe mgbagwojuanya bụ na onweghị onye ọzọ bubatara ọrịa n'ụlọ ọgwụ ahụ".

Nke a mere na onweghi onye tụrụ anya n'ụdị ọria ahụ dị n'ụlọ ọgwụ ahụ. Ya kpatara ha jiri gwọwa Victor Idowu ịba rụo mgbe ọgwụ ịba arụghịzị ọrụ.

Mgbe ahụ ka ha jiri mee ya nnyocha wee hụ na ọ bụ lasa fiva (lassa fever) ji ya, were bụrụ ya gawa ụlọ ọgwụ ukwu dị na Edo Steeti, ebe ọ nọrọ nwụọ.

Ka ọ dị ugbua otu nwaamadị bi na Lokoja bụ Idris Miliki Abdul sị na gọọmenti kwesiri igbabu mbọ n'ihu naezisara ozi maka ọrịa a na-enweghi ngwọta.

Ọ sị na "ọtụtụ mmadụ bi n'ime obodo amaghị ihe ekwe na-akụ maka lasa fiva (lassa fever)" na ọbụrụ na-emeghị ngwangwa meghere ọdachị, na ya bụ ọria nwereike ịsụ ndị mmadụ akwụ.

Chetakwa na ọrịa ahụ egbuola ndị dọkinta abụọ n'Ebonyi steeti n'izu gara-aga. Ndị dọkinta ahụ na ndị otu gwọrọ ndị bụ ọrịa ahụ bụtere ya bụ lasa fiva (lassa fever) ma nwụkwa na otu ụlọọgwụ ahụ n'Edo Steeti.

N'ime izu ụka garaaga, lasa fiva (lassa fever) tara isi otu onye n'ime mmadụ iri na ise butere ọria ahu na Federal Medical Centre (FMC) Keffi, Nasarawa steeti.

Ihe a bụ steeti ebe lassa fever rugoro n'Jenuwari afọ 2018

Akụko ka na-abịa

Isiokwu Ndị Emetụtara