Rochas Okorocha: 'Ndị asịrị kpachara anya ha!'

Rochas na ala Fulani na achụ ehi Image copyright Rochas Okorocha Facebook
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị Imo Steeti akwadoghị ị nye ndị Fulani na-achụ ehi ala

Gọvanọ na-achị Imo Steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na onweghị ala ya ga amaputa maka ndị Fulani na achị ehi n'Imo Steeti. Okwuru nke a unyahụ bụ mkpụrụ ụbọchị Jenụwarị iri abụọ na atọ n'ọwerri, isi obodo Imo Steeti.

Okwuru nke a site n'onu komishiona na-ahụ maka mgbasa ozi bụ ọkammụta Nnamdị Obiaraeri. Ozi ahụ kwuru na onweghị mgbe Gọvanọ Rochas jiri chee echichi ị nye onye ọbụla ala ndị Imo steeti.

O kwukwara na-asịrị niile ana anụ maka ịnye ndị Fulani na-achị ehị ala ndị Imo Steeti bụ ọrụaka ndị iro nakwa ndị mgbam na ndị ntụ.

Akwụkwọ akụkọ ekwubuola na Gọvanọ Okorocha sị na ya ga-enye ndị na achị ehị ala n'Imo Steeti nke ọtụtụ ndị Igbo katọrọ na ezoghị ọnụ. BBC Igbo gbara mbọ I kwuru Oje ozi Rochas maka mgbasa ozi mana nwaamadị ahụ bawara BBC mba gbanuọ ekwenti ya.

Ka ọdị ugbua, ndị Gọvanọ ndị ọzo n'ala ịgbo ekwuola na ha agaghị amapụta ala ọbụla maka ị nye ndị Fulanị na-achị ehị. Ohaneze Ndị Igbo akabichiela na onweghị onye ga enye ala ndị Igbo maka ịchị ehi.

Na River Steeti, Gọvanọ Nyesom Wike ekwuola na ya nweghị ala ya ji arụ ọrụ ma ya fọkwa nke ya na-enye mmadụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara