Kedu ihe ofe Egusi gị na-enye ahụ gị?

Egu a gbachara agbacha Image copyright Adline Okere
Nkenke aha onyonyo Egusi na-arịarị n'ahụ osisi nke na-etopụta n'ime elili

Ofe egusi bụ otu ofe ndị Igbo na-ejighi egwu egwu.

Ndị Igbo na mpaghara etiti Sahara na-eri ya nke ukwu ma jiri ya eleta ndị ọbịa.

A na-esikwa ya ebe a na-eme mmemme dịka ịgbankwụ, ikupụtanwa maọbụ ebe a na-akwa ozu.

Ọ bụ ofe ndị Igbo ji eme ọnụ mana tupu ọ bụrụ ofe, ọ na-agafe ọnọdụ dị icheiche.

Nkenke aha onyonyo Egusi na-amikarị ebe mmiri dị

Egusi bụ mkpụrụ na-esi ike elili a na-ekpepụ okpokoro azụ ya tupu akwọọ ya maọbụ sie ya.


Ọbụghị sọ ofe ka eji egusi esi, ụfọdụ ndị mmadụ na-eye ya eye a taa dịka ahụekere.


Mana kedu ihe Egusi gị na-enye gị n'ahụ?

Proteni (Protein) nke na-edozi anụ ahụ ruru ihe dịka pasenti 30 rue 40

Abuba (fat) rukwara ihe dịka pasenti 30 rue 40

Nri na-enye ike n'ahụ (Carbohydrate) ruru pasenti 10

Vitamin A, B1, B2, Ch na vitamin E, nke alfa-tokoferol so cha ihe no n'ime egusi.

Alfa-tokoferol na-enyekwa aka ime ka ahụ mmadụ dịka ọ kabeghi ma na-enyekwa aka maka ọmụmụ nwa.

Ihe dịka kalori 462 nọ n'ime otu efere ofe Egusi.


Egusi bụ ofe a na-eji ụtara dị icheiche eri.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo E ji akpụ maọbụ ọka na nrị ndị ọzọ eri ofe egusi

A na-ejiụtara akpu, ụtara ji, garrị, ụtara ọka, ụtara osikapa na ndị ọzọ eri ofe egusi.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ejikwa ofe egusi eri osikapa.

Etu ọbụla ịchọrọ iri ya, racha aka gị nke ọma mgbe ị na-eri ofe egusi.