Ọnụ na-ekwuchitere Buhari asabeghi ihe ọbụla gbasara akwụkwọ edemede Ọbasanjọ degaara Buhari

Onyeisi chịbụrụ Naịjirịa mbụ, Olusegun Ọbasanjọ
Nkenke aha onyonyo N'ime akwụkwọ Ọbasanjọ degaara Buhari, Ọbasanjọ kwuru na APC na PDP bụ otu ihe, wee kpọkuo otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ ka ọ malite.

Ka akụkọ edemede onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo degasịrị onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-ewuewu, mbọ niile BBC Igbo gbara maka ịnụ ihe ndị nọ n'oche ọchịchị ga-ekwu maka okwu a lara iyi n'ihi na ha asaghị.

Dịka ọtụtụ ndị n'ekwenye na akwụkwọ a Obasanjo degara onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ọ bụ ihe ziri ezi, ụfọdụ ndị akatọla ya, kwuo na Obasanjo bụ onye ama ama n'idegara ndị isiala akwụkwọ.

Ugbua ka anyị were ohere a nyocha ihe ndị pụtara ihe na akwụkwọ a nke Obasanjo zigara onyeisiala Buhari nke ọkpọrọ igwu dịna emeghị nkeọma Gọọmenti etiti,

  • Oke Ụnwụ na ụbịam
  • Enweghị nchekwa tara ọchịchị
  • Ahazịghị akụ na ụba nkeọma
  • Mgbahapụ ọrụ dịrị mmadụ
  • Ikpuchi ihe ọjọọ
  • Enweghị ọganihụ na olile anya
  • Enweghị nchịkọta obodo
  • Mmụbanye nke enweghị oke

Mana nke a akwụsịghị ndị mmadụ ikwu obi ha gbasara okwu a ọkachasị Gọvanọ Ekiti bụ Ayọ Fayọse na ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ:

Akụkọ a ka ga-abịa.