Ụkọrọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa: 'Iwe ji anynị'

Ndị nwe ụgbọala na-achọ ụzọ ọbụla inweta mmanụ ụgbọala Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị nwe ụgbọala na-achọ ụzọ ọbụla inweta mmanụ ụgbọala

Ụfọdụ ọdọ mmanụ na steeti dị iche iche na Naịjirịa na-ere mmanụ ụgbọala karịa narị naịra abụọ.

Ụkọ mmanụ ụgbọala alaghachiala na steeti dị iche iche na Naịjirịa ebe ụmụ Naịjirịa na-eti mkpu na ọtụtụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọ-ala anaghị ere ebe ndị na-ere anaghị ere n'ọnụ gọọmenti wepụtara.

Ha gara na igwe mgbasa ozi twitter we kwuputa ka ukọ mmanụ ụgbọala sị emekpa ha ahụ.

Ha katọkwara gọọmentị etiti.

Ụlọ ọrụ na-ere mmanụ na Naịjirịa bụ NNPC ekwuola na ụlọ mmanụ ha dị na steeti dị ichiche na Naịjirịa na-ere mmanụ n'ọnụ ego kwesiri nụ.

Gụrụ ihe ha na-ekwu na Twitter.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kee mgbe ahụhụ a ga-ebi? Ajụjụ ndị Naịjirịa kpụ n'ọnụ

Ụfọdụ na-ajụ mgbe ahụhụ a ga-ebe:

N'izu gara aga, onye isi Sineeti bụ Bukola Saraki kwere na ọ bụrụ na etnye akwụkwọ PIGB ka ọ bụrụ iwu ọ ga-ebelata nsogbu ụkọ mmanụ site na- ịkwụsi mmerụaka,izupu mmanụ petrolu:

Isiokwu Ndị Emetụtara