Oska akpụrụla ihe onyonyo ndị mba Kenya

Ebe foto si, Facebook/WatuWote
Mwakpoo nke bụtere ihe onyonyo a meere n'ime ụgbọala
Ngalaba na-ahụ maka ihe onyonyo na mba Amerịka bụ Oska ahọrọla ihe onyonyo nke ndị mba Kenya a na-akpọ, "Watu Wote" maka nkwanye ugwu.
Ihe, "Watu wote" nke nọ n'asụsụ Kiswahili pụtara n'asụsụ bekee bụ, "All of us."
O gosiri ihe mere mgbe ndị oyiohaegwu wakporo ụgbọ ala bu ndị mmadụ n'afọ 2015.
Ha gbagburu mmadụ dịka iri abụọ na asatọ mgbe ndị alakọba jụrụ ikewapụ onwe ha n'etiti ndị na-eso Kraist.
Lekwa ihe onyonyo nke ahụ n'okara ya: