Jim Mattis: 'ihụkwara ka ndi agha Indonesia si anwụ agwọ'

Ndị agha Indonesia Image copyright ADEK BERRY/AFP/Getty Images)
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Indonesia na-ebe ha na-eme ọzụzụ

O juru Jim Mattis ,Mịnịsta na-elekọta ndị agha nke Amerịka anya mgbe ọ nọ na-ekiri ndị agha Indonesia na-eme ọzụzụ.

Ndị agha a nọ na-aṅụ ọbara agwọ,were isi piawa okwute,ga ije n'elu ọkụ iji gosi na ha dị njikere maka agha.

Ndị ntaakụkọ so Mattis sị na ya bụ ọzụzụ juru ha anya.

Mattis, onye bụ ọbia n'Indonesia siri na ya bụ emume gosiri na a zụọla ndị agha indonesia ọfụma.

Image copyright ADEK BERRY/AFP/Getty Images)
Nkenke aha onyonyo Jim Mattis gara mgbaru na nke onyeisiala Indonesia Joko widodo

N'okwu ọnụ ya, "ihụ kwara ka ndị agha Indonesia si anwụ agwọ".

Ndị agha Indonesia na-arụkarị ọrụ n'ime ọhia,ya mere ha na agwọ na-ezu karị.

Isiokwu Ndị Emetụtara