Arsenal ekwelitala ọnụ ego Aubameyang

Aubameyang bụ nwaafọ Gabon na-agbara Dortmund bọọlụ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Aubameyang bụ nwaafọ Gabon na-agbara Dortmund bọọlụ

Otu Bọọlụ Arsenal eforola ntụtụ taa maka ịzụ onye bọọlụ ndị Borussia Dortmund bụ Aubameyang dịka ha agbalie la ọnụ ego ha n'ekwe n'isi rue nderi pounds iri ise na ọma.

Ndị nnọchite anya otu bọọlụ abụọ ndịa na aga n'ịhụ inwe mkparịta ụka maka azụma ahịa ahụ dịka.

Ndị otu Borussia Dortmund na-atụ anya na Olivier Giroud nke Arsenal ga-eso na azụma ahịa ahụ dịka onye ga-anọchị anya Aubameyang.

Otu Arsenal ahụla ego mbụ dị nderị pounds iri anọ na atọ ha kwere ndị Dortmund n'isi Aubameyang ajụrụ ajụjụ mere ha jiri tinye kwuo ego n'isi ya.

Ha kwenye siri ike na-azụma ahịa ahụ ga-enwe isi mana ọnọdụ ndị Dortmund nyere n'ime azụma ahịa n'ebute nsogbu.

Dortmund kwara Arsenal na ha agaghị ere Aubameyang ma ọ bụrụ ha enwetaghị onye ga-anọchị anya ya.