Ndị oyi egwu n'Afghanistan awakpola obodo Jalalabad

Ụgbọ agha dị na obodo Jalalabad ebe a gbara ogbunigwe ahụ Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Onye ogbunigwe mgbagbu onwe gbara otu ụgbọala nọ n'ihu ụlọ nlekọta ụmụaka

Ndị omekataraihepụụjọ a na-akpọ terrorists na bekee, gbaraa ogbunigwe tupu ha wakpo ụlọ ọrụ ebe a na-elekọta ụmụaka n' obodo Jalalabad dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Afghanistan.

Dịka otu onye ọrụ gọọmenti kwuru, ihe ruru mmadụ abụọ anwụọla, ebe mmadụ iri na otu nwere mmerụ ahụ.

Ihe ruru ndị ọrụ mmadụ iri ise nọ n'ime ụlọ ahụ mgbe ndị wakpọrọ ya.

Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ atọ bu egbe bụ ndị sọ na mwakpo ahụ, ebe a ka na-alụ ọgụ n'elụ ụlọ ahụ.

Onwebeghị ndị kwuru na ọ bụ ha mere ihe a.

Kedu ihe bụ ihe ọhụrụ?

Dịka Attaullah Khogyani, onye na-ekwuchite ọnụ onye Gọvanọ nke mpaghara Nangarhar siri gwa BBC, ihe mwakpo a bidoro mgbe ojiri ọkara gafe elekere anọ nke isi ụtụtụ mgbe otu onye oji-ogbunigwe-agbagbu-onwe gbara otu ụgbọala nọ n'ihu ụlọ nlekọta ụmụaka

Anya hụrụ ka o siri mee gwara ndị ntaakụkọ AFP na ọ hụrụ otu onye n'ime ndị ahụ ka o jiri egbe ukwu a na-akpọ RPG na-akwa ọnụ ụzọ ụlọ ọrụ ahụ.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọgụ gara n'ihu na mpaghara ebe ihe a mere ụbọchị ahụ niile

Kepu kepu BBC nụrụ kwuru na a gbagbuola mmadụ abụọ n'ime ndị oyi egwu ahụ.

E nwere ọtụtụ ndị ụlọ ọrụ nọ n'ebe ahụ gunyekwara ụlọ ọrụ ndị gọọmenti.

Isiokwu Ndị Emetụtara