Alexis Sanchez: "Ọ bụghị Thierry Henry Siri m pụọ"

Sanchez gbara bọọlụ n'Arsenal afọ atọ tupu ọ gawa na Manchester United n'afọ 2018 Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Sanchez gbara bọọlụ n'Arsenal afọ atọ tupu ọ gawa na Manchester United n'afọ 2018

Onye bọọlụ ọhụrụ otu Manchester United zụrụ bụ Alexis Sanchez ekwuola na Thierry Henry asịghị ya pụọ na ọ bụ mkpebi nke onwe ya.

Mgbe ọ gafechara n'otu Manchester United, Sanchez rụtụrụ aka na mkparịta ụka ya na Thierry Henry nwere.

Nke a mere ndị mmadụ jiri na-agba Henry ajụjụ ọnụ bụ nke o kwuru na "Onweghị oge m jiri si Alexis Sanchez pụọ na Arsenal."

Sanchez kwuru n'akara twitter ya na Henry hụrụ otu Arsenal n'anya, "otu ụbọchị na ọ ga dị mma ịhụ ya dịka onye nkuzi ndị Arsenal."

"Echetara m ụbọchị taa mkparịta ụka mụ na odogwu na bọọlụ bụ Henry nwere, onye gbanwere otu bọọlụ maka otu ihe ubọchị taa a bụrụla nkem"