IPOB: Ihe Obasanjo kwuru maka Buhari bụ eziokwu

IPOB Flag Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Gọọmentị etiti kpọrọ IPOB otu ndị oyi egwu

Ọnụ na-ekwuru otu Biafra (IPOB) bụ Emmanuel Powerful ekwuola na ndị nnọchịtere APC ọdịda anyanwụ kwadoro nhọpụta onye isi ala, Muhammadu Buhari maka ịzọ ọkwa ọzọ bụ "ndị akwụna ndọrọndọrọ ọchịchị".

N'akwụkwọ ozi Emma Powerful zipụrụ ndị ntaakụkọ, o kwuru na IPOB nwere nkwado n'ime okwu onye isi ala Naijiria mbu bụ Olusegun Obasanjo kwuru.

Cheta na ụnyaahụ,Obasanjo, kwuru na ọ ga dị mma ma ọ bụrụ na Buhari gbahapu ịzọ ọkwa ọzọ na afọ 2019.

N'ime ozi ahụ IPOB dere sị, "Ihe Obasanjo kwuru bụ echiche onye isi anyi bụ Nnamdi Kanu. Obasanjo kwuru ezi okwu. Ndị niile gara ileta Buhari kwesịrị ikpuchi ihu ha n'ihere."IPOB akpọrịala ndị APC ọdịda anyanwụ

Image copyright Nnamdi Kanu/Facebook
Nkenke aha onyonyo Onweghi onye ma ebe Nnamdi Kanu, onye isi IPOB nọ ugbua

IPOB bụ otu na-achọ mnwere onwe ọchịchị nke ha, a ga-akpọ Biafra.

Na ụbọchị isi gara aga, ụlọ ikpe nọ n' Abuja kwetara na IPOB bụrụ otu na-eyi egwu.

Mana IPOB ekwuola na ha ga ebuga ikpe n' ụlọ ikpe kachasi n'ala Naijiria

Ugbua, onweghi onye mara ebe onye isi ndị IPOB bụ Nnamdi Kanu nọkwa.

Ụlọ ọrụ onye isi ala enweghị ihe a kwuru banyere okwu Obasanjo kwuru gbasara Buhari na ịzọ okwa ọzọ na 2018.

Chetakwa na onye isi ala Muhammadu Buhari ekwubeghị ma ọ ga-azọ ọkwa ọzọ na afọ 2019.