Tanka bu mmanụ ụgbọ-ala agbaala ọkụ n' Ojo

Ijegun fire Image copyright LASEMA
Nkenke aha onyonyo Ọkụ tanka agbala ọtụtụ mmadụ na oge gara aga na Legos

Onyeisi ndị na-emenyu ọkụ na, Legọọsi steeti bụ Rasak Fadipe ekwuola na onweghi onye nwụrụ n'ime ọkụ ahụ gbara n'ehihie ụbọchị 24 Jenuwarị, 2018.

Ọkụ tanka bu mmanụ ruru puku iri atọ na atọ n'ime ya, gbaara ọkụ n'Ojo, Lagos Steeti.

Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ na-agbaọsọ ndụ n'ebe ahụ.

Rasak Fadipe gwara ndị ntaakụkọ na "Ozugbo m nụrụ maka ọkụ a ka m kpọrọ ndị na-emenyụ ọkụ dị n'Ọjọ, ha gbatakwara ebe ọkụ a na-ere."

"Mana mgbe anyị ruru ebe a ka anyị hụrụ na ọ bụ mmanụ ụgbọala na-agba ọkụ. Ọ bụ mgbe ahụ m kpọkọtara ụlọọrụ ndị ọzọ na-emenyụ ọkụ ozugbo ozugbo."

Image copyright LASEMA
Nkenke aha onyonyo Okwu mmanu ugbọala gbara n'uzọ ana-agbakarị

"Ndiuweojii na ndị agha mmiri nyere ndị Lagos State Emergency Management Agency (NEMA) enyemaka ịmenyụ ọkụ ahụ n'elekere atọ na nkeji iri atọ nke ehihe"

Olayinka Ajaba bụ onye nnọchịanya NEMA kwuru na nsogbu nke a sị n'oge ha jị aka na-amịpụta mmanụ ụgbọ ala .

Onye isi ndịuweojii n'Ijegun bụ SP Audu Ibrahim, gwara ndị ntaakụkọ na ha gbaara mbọ hụ na udo di mgbe ya bụ ọkwụ na-agba.

Ugbua, ndi obibi Ijegun Ibasa ekwuola na ha chọrọ ka gọọmentị Lagos steetị guzobe ulọ mmenyụ ọkwụ n'akụkụ ebe ahụ dika NAN sịrị kọọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara