"A ga meebugide okwu unu kwuru ruo ụbọchị ọnwụ m" - Larry Nassar

Larry Nassar Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Larry Nassar nwere ike inwụ n'ụlọ mkpọrọ

Ọka iwu nke ala Amerika ezila dọkịnta otu egwuregwu gymnastics nke a na-akpọ Dokinta Larry Nassar gaa ụlọ mkpọrọ.

Dokinta Larry Nassar ga-aga n'ụlọ mkpọrọ ruo afọ otu narị, iri asa na ise.

Ụmụ agbọghọ narị, iri isi bụ ndi tụrụ Larry Nassar aka ebubo.

Nassar gwara ndi umu agbọghọ ahu na "a ga meebugide okwu unu kwuru ruo ụbọchị ọnwụ nkem"

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oka iwu Rosemarie Aqualina bụ onye mere mkpebi ahụ

Nassar, dị afọ iri ise na anọ kwetara na ikpe mara ya gbasara mmegbu mmekọahụ ọtụtụ nwata nwanyị na nwa agbọghọ bụrụ ndi na asọmpị olimpiks n'ala Amerịka.

Onyeokaiwu Rosemarie Aqualina gwara Nassar na ọ ga-anọ n'ime ọchịchịrị na ndụ ya niile maka mmejọ ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara