Gọọmentị Buhari enyela Obasanjo ọsịsa edemede o dere

O kenere Obasanjo maka edemede ya si na ha ga-aṅantị na ndụmọdụ ya. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo O kenere Obasanjo maka edemede ya si na ha ga-aṅantị na ndụmọdụ ya.

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naịjirịa bụ Lai Mohammed asala edemede nke Obasanjo degara Buhari n'ụbọchị abụọ gara aga site na ị gụsị ihe ndị gọọmentị mere n'afọ atọ gaara aga.

Ihe ndị ọ gunyere bụ ibuso mpụ agha, ịkwalite ọkụ latrik, ịtụgharị akụ na ụba ala Naịjirịa na ịweta ọrụ dị iche iche n'obodo .

O kwuru na onwere ike, 'Obasanjo amaghị ịhe niile gọọmenti na-eme n'ihi na o nweghị ohere'.

Abali ole ma ole gara aga onye bụbu onye isi ala bụ Olusegun Obasanjo degara Muhammadu Buhari edemede kwa ya na ikpa oke na etinyeghị uchu na ọrụ emela ka ọghara ime ọfụma na ịkwalite akụ na uba Naijiria.

Nkenke aha onyonyo Obasanjo degara Bụhari kwa ya ka ọ ghara ịzọ ọkwa ọchichị n'afọ 2019

Ka nke a na-aga, onye na-ekwuchite ọnụ otu nọ n'ọkwa ọchịchị, APC na Lagos bụ Joe Igbokwe gwara BBC na onweghi oge Buhari kwupụtere na ọ ga-azọ ọchịchị onye isi ala na ntụlịaka nke afọ 2019.

"Buharị ga-arụ ọrụ Chineke zigara ya ka ọ rụọ n'isi."

Ọ si kwa na Buhari ga-ejisike ịgba mgba megide mpụ na ezumohi na-aga na Naịjirịa.

Tupu Mohammed zaghachiri edemede nke a, Obasanjo na-ewu n'elu igwe okwu Twita:

Ihe butere nke a bụ edemede o degara Buhari na-adọ ya aka na ntị maka ọnwụ ndị mmadụ n'aka ndị ọchị ehi.