E nwere ike iwa Olisa Metuh ahụ

Metuh nwere ikpe nọ n'ụlọ ikpe e tinyere n'ụbọchị nkwo 29 jenuwarị Image copyright Channelstv
Nkenke aha onyonyo Metuh nwere ikpe nọ n'ụlọ ikpe e tinyere n'ụbọchị nkwọ 29 Jenuwarị

Onye na-ekwuchite ọnụ ya bụ Sam Ben-Nwosu gwara BBC na ọ nọ n'ụlọ ọgwụ kemgbe ụbọchị anọ gara aga.

Ben-Nwosu sị na ihe na-arịa Metuh bụ ọrịa ọkpụkpụ azụ nke pụtara.

Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-abuga Metụ ụlọ ọgwụ ọzọ (nke ga-eme ya atọ) n'Enugwu iji nwe odido anya ịmata ma a ga-awa ya ahụ.

Cheta na a gba ọsọ buga Metuh nnukwu ụlọ ọgwụ, Nnamdi Azikiwe Teaching Hospitalụ dị na Nnewi Anambra Steeti ka ọ dara ahụ.