'Anyị ga-agbachi ụlọọgwụ a ọbụrụ na azaghị anyị' - Ndị ọrụ

Ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric bụ ebe ana-eme nyocha gbasara ọrịa isi mgbaka Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric bụ ebe ana-eme nyocha gbasara ọrịa isi mgbaka

Nsogbu ndị ọrụ ụlọọgwụ Federal Neuropsychiatric dịna enugwu ewerela ọnọdụ ọzọ, dịka ha kpọkuela Gọọmenti etiti ka ha tinye ọnụ n'okwu ahụ n'ime otu izụka ma ọ bụ ha mechie ụlọ ọrụ ahụ.

Iwe ndị ọrụ ahụ dina ebe onye Diratọ na-ahụ maka ahụ ike bụ Jojo Onwukwe nọ maka oke mmebi ọnọdụ ụlọọgwụ ahụ nke gunyere mpụ, nrụrụaka, ọchịchị aka ike na nleda anya usoro ọrụ.

Ndị otu Joint Health Sector Union (JOHESU) nke ụlọ ọgwụ ahụ dere akwụkwọ mkpesa ma nye onye Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Oka nmụta Isaac Adewole izu ụka abụọ iji lebanya n'okwu ahụ.

Ihe rụtụrụ aka n'akwụkwọ ahụ gunyere:

  • Akwughị ha ụgwọọrụ na ihe ndị mgbakwunye dịna ya site n'ọnwa febụwarị 2017 rute taa
  • mkpachị ihe mgbakwunye dịna mbuli elu n'ọrụ
  • Akwughị ha ụgwọ maka nkuzi ihe
  • Etinyeghị ha n'usoro ikwụ ụgwọ nke Integrated ayroll Personnel Information System (IPPIS).

Mgbe ndị ntaakụkọ BBC gbara otu onye Dọkịta n'ụlọ ọrụ bụ Ugwuonye ajụjụ ọnụ, ọ kwuru na ọ bụ eziokwu na-enwere nsọgbụ n'ụlọ ọgwụ ahụ mana ọ bụ ndị otu JOHESU dere akwụkwọ mkpesa ahụ.

Onye ọde akwụkwọ ukwu otu jịkọrọ ndị ọrụ bụ Ejike Ihezue mgbe agbara ya ajụjụ ọnụ rụtụrụ aka n'ihe ndị ahụ ede pụtara dịka iwe ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ.

O kwu kwara na onweghị ikike iwepụta akwụkwọ mkpesa ahụ edegara onye Mịnịsta na-ahụ maka ahụike.

Mbọ niile agbara i nweta onye Diratọ ụlọ ọgwụ ahụ bụ Jojo Onwukwe n'ekwe ntị adịghị ire dịka ọ naghị aza ekwe ntị ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara