Ndị na-egbu ugbo azụ akwadola ka a machie ịtụbata azụ

Azụ
Nkenke aha onyonyo Sọọsọ pacent ịrị atọ azụ a na-eri na Naijiria bụ nke e nwetara n'ala anyị

Ndị ọkụ-azụ na ndị na-azụ ya n'ala Naijiria akwadola ka a machie ịtụbata azụ.

Otu onye n'ime ha,bụrụkwa onye nwe Sprout Jet Ltd bụ Chukwudi Adibe gwara BBC sị: "Ọ ga-eme ka ndị na-egbụ ugbo azụ nwe mbawanye n'ihi na ọ ga-enye ha ohere ire azụ karia ka ọ dị na mbụ,meekwa ka akụ na ụba Naijiria na-aga n'ihu."

N'ụbọchị ịrị abụọ na anọ nke ọnwa Jenuwarị, ndị omeiwu nta kwuru na ha chọrọ ka a machie ịtụbata azụ na nwayọọ nwayọọ, iji mee ka ebido na-enweta azụ nile ana-eri n'ala anyị.

Alo nke otu n'ime ha bụ Mr. Tasir Olawale-Raji bulitere, kwuru na oke ịtụbata azụ mere Naijiria ala ebe a na-atụbata ụdị azụ dị iche iche nke gunyere azụ ndị adịghị mma mmadụ iri.

Ndị omeiwu ahụ kwuru na o were ha anya na ọ bụ nanị metrik tọn puku iri asatọ ka a na enweta n'ala Naijiria nke bụ pacent iri atọ n'ime nde abụọ, puku nari asaa a chọrọ maka oriri.

Isiokwu Ndị Emetụtara