Ọria yelo fiva na Naijiria: Ihe ị kwesiri ị ma maka ọgwụ mgbochi

Anwụnta (Aedes albopictus) Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Aedes albopictus bụ anwụnta na-ebute ọrịa yelo fiva

Taa bụ nkwọ, ụbọchị ịrị abụọ na ise na onwa Jenụwarị, Gọọmentị Naijiria bido inye ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ọrịa yelo fiva.

Otu na-ahụ maka ahụike na uwa niile gba gburugburu bụ World Health Organistion na bekee ga-eso kwa na nyemaka mmega ahụ nke a.

Mana cheta na oge gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ bị n'ugwu Naijiria na-atụ egwu ịgba ọgwụ mgbochi maka akụkọ asịrị na-ekwu na ọ na-ebuta amụtaghị nwa.

Na Februwari na afọ 2013, agbagburu ndị ọrụ ahụike na-enyeọgwụ mgbochi ọrịa polio itoolu na Kano Steeti.

Gịnị bụ ihe pụrịche na mgbasa okwu a?

Ugbua, ọ dịzịka echiche ahụ na-echeharị.

Otu dọkịta bụ Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ọtụtụ mmadụ na-apụta mgbe niile a na-agba ọgwụ mgbochi.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gọọmentị chọ ka ọgwụ mgbochi a metụta mmadụ nde abụọ n´ise

Mgbolu kwuru na "kemgbe meningitis na lasa fiva pụtagharịrị, ọtụtụ ndị mmadụ na-apụta ịgba ọgwụ mgbochi".

"Ugbua ndị na-achị obodo na ndị otu di ichiche na-enye aka igbasa ozi a," Mgbolu kwuru.

Onye n'onye ka a ga-agba ọgwụ mgbochi?

Gọọmentị Naijiria ekwuola na ọbụ mmadụ nde abụọ na ise ka ha ga-enye ọgwụ mgbochi nke a.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Na afọ 2026 gọọmentị chọrọ ikpochapu ọrịa yelo fiva

Ihe a ga eme ka ọgwụ mgbochi a bụrụ nke kachasi gọọmentị mee gbasara ọrịa yelo fiva.

Ọgwụ mgbochi a bụ maka ikpochapụ oria yelo fiva na afọ 2026.

Ịgba Ọgwụ mgbochi a ga ebido na steeti Kogi, Kwara na Zamfara.

Na Bornu Steeti, gọọmentị ga-enye ọgwụ mgbochi a n' ebe ndị na- agba ọsọ ndụ na-ebi (IDP camps).

Mgbasa ọria yelo fiva na Naijiria ugbua

  • O bido na ọnwa Seputemba na afọ 2017 na Kwara Steeti
  • Mmadụ narị atọ, ịrị ise na asatọ bụ ndi nwere oria nke a na steeti ịrị n'isi na onwa Januwarị na afọ 2018
  • Steeti isi bụ Kano, Kebbi, Kogi, Kwara, Nasarawa na Zamfara nwere ọrịa nke a
  • Ndị nwere ọrịa nke a bụ ndị na karịrị afọ ịrị abụọ bụrụ 65.9%.

Onye kwuru: WHO

Gịnị bụ yelo fiva?

Yelo fiva bụ ọrịa ahụụnta na-ebute.

Ugbua, otu WHO na-ekwu na ọrịa ahụ amalitela na obodo Ifelodun na Kwara Steeti.

Ha kwukwara na ihe dịka mmadụ nari atọ, ịrị ise na asatọ nwere ike ị nwe ọrịa yelo fiva na steeti ịrị na isi na ala Naijiria.

Nke a emeela ka mmadụ ịrị na isi nwụọ.

Gini ka akwusi oria yelo fiva?

Ọ bụlụ na ịgba bere ọgwụ mgbochi, ihe ị kwesịrị ịme bụ ị kwụsị ọtịta ahụhụ n'ebuta iba.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ụlọ mgbochi anwụnta di mkpa ị kwusị ọrịa yelo fiva

"Anyị niile kwesịrị ị nwe ụlọ mgbochi ahụụnta. Naani ya ga kwụsị oria yelo fiva," Dọkịta Mgbolu kwuru.

Isiokwu Ndị Emetụtara