Thomas Dennerby bụ onye nkwuzi ọhụrụ Super Falcons

Thomas Dennerby Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Thomas Dennerby di afọ iri ise na isi

Otu egwuregwu Super Falcons nke ala Naijiria enwela onye nkụzi ọhụrụ aha ya bụ Thomas Dennerby.

Onye isi otu egwuregwu bọọlụ na Naijiria bụ Amajụ Pinnick kwuru nke a n'elu Twita.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Super Falcons emeriela na asọmpi iko ụmụ nwanyị Afrika ugboro asaa

Ozigbo ụfọdụ ndị hụrụ egwuregwu bọọlụ n' anya nụrụ nke a ha bidoro na-ekele Pinnick n'elu Twita.

Dennerby bụ onye egwuregwu bọọlụ otu Hammarby na Sparvagens na oge gara aga.

O sokwa na otu ndi egwuregwu bọọlụ ụmụ okorobia dị afọ iri abụọ na otu nke Sweden.

Dennerby rụkwara ọrụ ndị uwe ojii. Bụrụkwa onye nkụzi nke otu Allsvenskan na Hammarby na afọ 2001.