Suarez na Messi pianyelụ Barca na ọkara mmechi Copa Del Rey

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Barcelona ebutala Copa del Rey ụgboro iri abuọ na itoolu

Ndị ji iko Copa Del Rey na Spain bụ otu bọọlụ Barcelona abanyela na agba nke ga abị tupu mgbacha iko ahụ nke afọ a. Nke a mere ka ha meriri otu bọọlụ Espanyol 2:0 na sọọmpị nke ha gbara ụnyahụ.

Na mpi nke izizi ha sọrọ, Espanyol ji otu ọkpụ merie Barcelona, mana ka Barcelona gbara ha ọkpụ abuọ ha asọghi, o Barca gara na iru.

Luis Suarez na Lionel Messi bu ndị nyere gool Barcelona na ọkara nke abuọ na sọmpị ahụ.

Suarez meporo ọnu gool tupu Messi mere ya abụọ na nkeji iri abụọ na ise na ọkara abụo asompi ahụ.

Philippe Countinho gbara bọọlụ nke mbu ya kemgbe egotere ya ka ọ nochiri anya Andres Iniesta na nkeji iri isii na asatọ.

Barcelona na ejekwu Valencia, Sevilla na ndị meriri Real Madrid, Leganes, na semi-final.

na mgbacha Copa del Rey na afọ gara aga, Barcelona meriri Deportivo Alaves 3-1 ji buru iko ahụ.