Donald Trump na-enye ndị isiala Afrịka nnụkwụ ekene na Davos

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionTrump na Kagame nwere mkpakorịta na Davos

Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump si Paul Kagame onyeisiala Rwanda nakwa onyeisioche otu na ahụ maka mba Afrịka niile bụ African Union ka ọ zigara ndị isi Afrịka ndi ọzọ ụkpa ekene.

Trump kwuru ihe a mgbe ya na Kagame nwere mkpakọrịta na Davos.

Cheta na Trump kpọrọ mba di ichiche na Afrika "ọnụnụ nsị".

Trump ekwuola na ya ekwughi okwu a a si na o kwuru.

Mgbe Trump na Kagame biara ịlụ na ịlụ, Trump emeghị ka ụkwụ esighị ya ike maka ihe ahụ mere.

Ọ si na mkpakọrịta ya na kagame nwere gara ọfụma, we kpọ mba ha abụọ ndi na azụkorita ahia bụ ezigbo ọghị.

Trump kwukwara:

"A sim kam kene gị, onyeisiala, otu i siri bụ onyeisioche ndị African Union ọhụ... Amam na i na aga nzụkọ nke mbụ gi na mgbe adighị anya. Kene ndị otu gi."

Kagame na onweya si na ha kpara maka mmekọ mba ha abụọ, ma nkwadọ Amerịka na enye Rwanda na uwa niile. Ọ si na ha kwukwara maka ndị Amerịka na aga ezumike na Rwanda.

Isiokwu Ndị Emetụtara