Gịnị kpatara ndị mmadụ ji ada n'ike nwụọ?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỌ bụrụ na ọbara abaghị n'akụkụ ụbụrụ ebe mmadụ si eku ume, onye ahụ ga-anwụ

Akụkọ gbasara ndị mmadụ ida nwụọ n'otu ntabi anya mgbe ha na-eme ihe egwuregwu di icheiche ma ihe ndị ọzọ abụrụla chi bọọ anụ ọzọ.

Onye ndụmọdụ Gọvanọ Lagos Steeti n'okwu azụma ahịa bụ Deji Tinubu dara nwụọ ụnyaahụ oge na-asọmpi bọọlụ.

Nwa amadị a so na ndị otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ Naịjirịa, rụkwa ọrụ dịka onye Kọmishọna na-ahụ maka egwuregwu na Legos Steeti.

Ọnwụ ya ebutala oke arụmụka gbasara ihe mere ndị mmadụ jiri anọkata ha adaa nwụọ na ntabi anya.

Cheta na ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa anwụọla etu ahụ, ndị a gunyere ndị egwuregwu bọọlụ dịka Sam Okwaraji, Endurance Idahor na John Ikoroma.

Ndị ọzọ dara ma nwụọ gunyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị na-eme ihe ngosi onyonyo.

Mgbe ndị ntaakụkọ BBC gbara otu onye dọkịta ahụike bụ ọkanmụta Eddy Nwobodo ajụjụ ọnụ, o kwuru na enwere ọtụtụ ihe nwereike ịkpata mmadụ ida ma nwụọ.

Image copyright Science Photo Library
Nkenke aha onyonyo Mmadụ kwesiri ị ga n'ụlọọgwụ ga nyochasịa mkpụrụobi na ahụ ya oge ọ bụla ijị mgbochie ma ọ bụ belata oke ọdịda ọnwụ bụ

Isiokwu Ndị Emetụtara