Onyeisiala Buhari agawala nzụkọ otu AU n'Etiopia

Buhari n'ụgbọelu Image copyright APC Twitter
Nkenke aha onyonyo A na-ele anya na Buhari ga-alọta ozigbo emechara nzụkọ ahụ

Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Abuja taa gawa Adis Ababa dị na mba Etiopia maka nzụkọ otu mba Afrịka a na-akpọ AU.

Dịka onye nkwuchite ọnụ onyeisiala bụ Femi Adesina siri kwuo, nzụkọ ahụ bụ agba nke iri atọ ya ga-ele anya n'isi okwu bụ "Imeri agha a na-ebuso mpụ: ụzọ ga-edu mpaghara Afrịka inweta ezi mgbanwe,"

Nke a bụ nke mbụ otu AU ga-eji okwu gbasara ichụ mpụ ọsọ mee isi okwu ya.

Cheta na n'ụbọchị anọ ọnwa Julai, afọ 2017, ka ndị ndu mba Afrịka niile jikọrọ aka ọnụ mee onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari onye ndu n'agha a na-ebuso mpụ na mpaghara Afrịka niile.

Nkwado ahụ ha nyere ya n'agba nzụkọ ahụ gara aga bụ maka uchu ọ na-etinye na iluso mpụ ọgụ na Naịjirịa.

Isiokwu Ndị Emetụtara