Etu mkpụrụ obi si arụ ọrụ na-akpata mmadụ nọkata ọ daa
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

"Ọ bụrụ na ọbara abaghị n'akụkụ ụbụrụ ebe mmadụ si eku ume, onye ahụ ga-anwụ'

O kwuru na ọ bụrụ na obi mmadụ enweghị ike iwepụta ọbara ga-agazụ ahụ niile, ụfọdụ mpaghara ahụ nwere ike ịkpọnwụ, nke nwere ike ibutere ọnwụ.

O kwukwara na ọbara mgbalielu nwekwara ike ibutara mmadụ ọnwụ ike ma ọhapụ nyocha gbasara obi ya n'oge niile ihe

Nwobodo siri na ọ bụrụ na ọbara ịga mmadụ n'isi nke bụ ọria stroke n'olu bekee so n'ihe na-eme ka mmadụ daa ma nwụọ.

O kwuru n'ụzọ a ga-ejị gbochie maọbụ belata ọnọdụ a bụ mmadụ ị ga n'ụlọọgwụ ga nyocha obi ya nakwa ahụ ya niile kwa oge.