Otu pati akpọla oku maka nchịgharị gọọmenti Naịjirịa

Map of Nigeria Image copyright Google
Nkenke aha onyonyo nchịgharị gọọmenti bụ okwu na-akpotụ akpọtụ na Naijiria ugbua

Otu kọmiti na-etinye anya na ihe gbasara nhazi ọchịchị na Naịjirịa nke ndị otu APC akpọla oku ka ahazigharịa ọchịchị na Naịjirịa.

Kọmiti ahụ nke Gọvanọ na-achị Kaduna Steeti bụ onye isi ya kwuru ka achịgharịa ihe ruru mkpụrụ iri dị n'akwụkwọ iwu.

Mana onyeisi otu pati APC n'Enugwu bụ Ben Nwoye kwuru na otu kachasị elu n'ime pati ahụ emebeghi nzụkọ ga-anabata akwụkwọ ahụ kọmiti ahụ dere.

O kwuru na otu pati ahụ akaghị nabasịa ya bụ akwụkwọ rue mgbe ha mere nzụkọ di elu ebe ndị niile ọgbasara ga agbakọ tinye anya n'akwụkwọ ahụ.


Ihe iri kọmiti ahụ kwuru

1. Njikwa akụ na ụba - Kọmiti ahụ dere ka akụ na ụba Naịjirịa dịka mmanụ agbidi ga na steeti. K e mezie iwu gbasara mmanụ ka o gosi na steeti nwere ike inye ndị mmadụ ikike igwupụta mmanụ.

2. Ịzọ ndọrọndọọ n'onwe - Kọmiti ahụ kwukwara ka e nwe ohere maka ndị chọrọ ịzọ ọchịchị n'onwe ha na abenyeghi otu pati ọbụla mana ka ndị dị otu a ghara inwe akwụkwọ maọbụ kaadị otu pati ọbụla rue ọnwa isii tupu ntuliaka onye ahụ chọrọ ịzọ.

3. Ikewapụta steeti na mkpokọ - Kọmiti ahụ ekwetaghị na ikewapụta steeti ọhụrụ dịka ha kwuru na nke a agaghị amịta mkpụrụ bara uru.

4. Nwere onwe ndị gọọmenti okpuru ọchịchị - Kọmiti ahụ kwuru ka ahapụ ka steeti na-elekọta ndị okpuru ọchịchị nọ na steeti ha.

5. Ndị Uwe Ojii na ndị nchekwa ụlọ mkpọrọ - H kwuru ka ewpụ ndị uwe ojii n'okpuru gọọmentu etiti tinye ya na steeti ebe a ga-enye ndị uwe ojii steeti ohere gbasara ụfọdụ okwu.

6. Ụbọchị ezumike - Ha kwuru ka ewepu okwu gbasara inye ụbọchị ezumike n'okpuru gọọmentị etiti tinye ya ka gọọmenti etiti na steeti nwe ike inye ụbọchị ezumike nke steeti maọbụ nke gọọmenti etiti.

7. Stampụ - Ndị kọmiti ahụ na-ekwu ka steeti na-enye stampụ gbasara ndị na-azụ ahịa.

8. Nwa ọdịnaala - Ha kwuru ka ewepụ ebe a na-ede okpuru ọchịchị ebe isi oge a na-edenye aha n'akwụkwọ tinye steeti ebe i bị. Ebe a, ha kwuru ka enye onye birila otu ebe ọtụtụ ohere ịzọ ọchịchị ebe ahụ obirila.

9. Ndị ọkaikpe - Ha kwuru ka ekewapụta otu ndị ọka ikpe nke steeti ndị ga-ahọpụta ndị nnọchi anya ha ma dọọkwa onye ọkaikpe ọbụla mehiere aka na ntị.

10. Referandum - Ha kwuru ka emezie akwụkwọ iwu ka o nye ohere maka referandum ma ọ bụrụ na o nwe okwu dị oke mkpa dapụtara tupu ekpebie ya.


Oge ọ natara ya bụ akwụkwọ, onyeisi pati APC bụ Adigie Oyegun kwuru n'ọnwa Febuwarị, ndị otu pati niile ga-agbakọ lemie anya n'akwụkwọ ahụ.

N'aka nke ọzọ, ndị otu pati PDP kwuru na ha na-eleba anya n'akwụkwọ ahụ tupu ha ekwuo ebe otu ha kwụ na ya bụ akwụkwọ.