Ndị agha mmịrị Naijiria na-ekwu okwu ike

Nigerian Navy Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha mmịrị emebigo ọtụtụ ụlọ ọrụ nzizo na-amịpụta mmanụ agbịdị

Nke a abụghị mbu ndị agha mmịrị mebiri ụlọ ọrụ nzizo na-esi mmanụ agbịdị na mpaghara Naija-Delta nke ala Naijiria.

N'ọnwa Febrụwarị nke afọ 2017, ndị agha mmịri mebi ụlọ ọrụ nzizo na-esipụta mmanụ agbịdị atọ na Delta na River Steeti.

Ha jidekwara ọtụtụ mmadụ na mkpọrọ maka mmejọ nke a.

Cheta kwa n'ọnwa Maachi nke afọ 2017, ndị okaiwu ala Naijiria dọrọ ndị agha mmịrị aka na ntị, sị ka ha kwụsị ịmebi ụlọ ọrụ nzizo na-esipụta mmanụ agbịdị n'ebe Naijia Delta.

Ugbua, ndị agha mmịri emebigo ihe karịrị nari abụọ na abụọ ụlọ ọrụ nzizo na-amịpụta mmanụ agbịdị na ala Najiria.

Ha na-ekwupụta ya oge ọbụla n'elu Twita.

Mana otu okachamara n'ihe gbasara mmanụ agbịdị bụ Benjamin Amaechi gwara BBC Igbo n'elu ekwentị na ihe ndị agha mmịrị ahụ mere dị njọ.

"Ha chọkwa oganihu, ha ga-achọ ka ha ga-esi kpọbata ụmụ ndị a na-esipụta mmanụ agbidi nzuzo ka obodo nwee udo. Mana ka ha si emebisi ihe maka na ha ji egbe n'aka, enweghị ihe ga-apụta n'ime ya."

Cheta kwa na ọtụtụ ndị bụ okachamara n'ihe gbasara gburugburu ekwuola na omume ndi ụlọ ọrụ nzizo na-esipụta mmanụ agbịdị na-emebi ala na azụ dị na mmiri.

Amaechi ekweghị na nke a.

O kwukwara na, "Ihe a bu maka izọpụta ndu ha na agụụ. Ihe gọọmentị Naijiria kwesịrị ime bụ ikuziri ha nke bụ ụzọ nke di mma iji rụọ ọrụ a, nke bekee kpọrọ 'standard practice'.

"Ihe a ga-eme ka Naijiria nwe ike ịzọpụta ndu anyị niile."

Ndị agha mmiri ekwuola na ha ga-agba mbọ kwụsị kpomkwem omume ndi ụlọ ọrụ nzizo na-esipụta mmanụ agbịdị na Naija-Delta.

Isiokwu Ndị Emetụtara