Buhari emela ndị omeiwu omee-abughịnso

Muhammadu Buhari Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọchịchị onye isi ala Naijiria bụ Buhari na-ebu agha megide mpụ

Onye enyemaka onye isi ala na ihe gbasara ụlọ ọmeiwu, bụ Senitọ Senator Ita Enang,gwara ndị nta akụkọ nke a n' ụbọchị ịrị abụọ na isii ka onye isi ala tinyechara aka na iwu ndị a.

Iwu a nke akpọrọ, "Iwu ike na ohere nke ụlọ omeiwu nke afọ 2018" na-enye ndị omeiwu nke steeti na gọọmenti etiti nchekwa ka a ghara igba ha akwụkwọ maka ihe ha kwuru maọbụ mee oge nnọkọ ha na-aga n'ihu.

Iwu ahụ bụ otu n'ime iwu asatọ nke onye isi ala tinyere aka n'ime ya mere ka ikike ndị omeiwu nwere ịkpọ onye masịrị ha oku na inye iwu ka anwụchiee onye dara iwu ahụ.

Iwu ndị ọzọ Buhari tinyere aka gunyere; iwu mebere the National Institute of Legislative Studies (Amendment) Act, 2018 maka ọzụzụ ndị omeiwu, iwu maka nkwekọrita ikwusi Ina ụtụ isi ugboro abụọ, dị na etiti Naijiria na mba Spain na iwu mebere otuChartered Institute of Project Managers of Nigeria (Establishment) Act 2018; iwu na-ahụ mak ndị okenye ana akpọ "National Senior Citizens Center Act, 2018,.