Ndị mmadụ na-ejizi ekwenti ha na kọputa ha azụ ahịa maka ọdị mfe karịa ị ga nime ahịa
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ihe iri ị na amaghị gbasara ekwentị gị

Ndị nyocha ekwuola na ekwentị na kọmputa bụ ọdị n'ihu ụwa n'ihi na mmadụ niile nwere ntụkwasị obi ebe igwe ndị a dị ọkachasị ekwentị ha.

Nke a kpatara ndị nyocha jikwara kwuo na ndị mmadụ anaghịzị enwe mmekọ ebe mmadụ niile tinyere anya n'ekwenti ha.

Ọnọdụ a eruola na di na nwunye na anọ n'otu imeụlọ mana ha ji ekwenti akpankata karịa igwa onwe ha okwu.

Mike Arnold n'igwe mgbasaokwu instagram na-ekwu etu ndị mmadụ si eme ma ekwenti ha fuo.

N'aka nke ọzọ ndị ụlọ ọrụ na-emepụta ihe chọrọ ka ndị mmadụ nọrọ n'ekwentị ha oge niile ka ha nwe ike ree ahịa ha kpọsara.

Onye ọzọ n'instagram jiri ihe o dere kọwapụta etu ndị mmadụ si etinye uche n'ekwentị ha. O kwuru na ekwentị anaghị ekwe ndị mmaọ̄ụ hie ụra n'abalị nke kpatara na ha ga-eji ekwentị ha n'aka mana ehi ụra.


Ihe ndị ị na amaghị gbasara ekwentị gị

1. Etu ahụ si eme ndị na-aṅụ ọgwụ ike ma ha aṅụghị ọgwụ bụ etu o si eme ndị nwere ekwentị. Nke a pụtara na inye nwatakịrị ekwentị dịka inye ya ọgwụ ike.

2. Ekwentị nwere nje ugbo iri na asatọ karịa aka ebe a na-aga mkposi.

3. Radieshhọn si n'ekwentị na-ebute arahụghị ụra, isiọwụwa na mgbagwojuanya.

4. Orịa a na-akpọ "Nomofobia" bụ ụjọ itufu ekwentị gị maọbụ na ịgaghị enweta netwọkụ.

5. Ndị mmadụ nwere ekwentị n'ụwa karịa ka e nwere ebe mkposi.

6. Ndị mmadụ na-akpọpe ekwentị ha ihe ruru ugbo otu narị na iri kwa ụbọchị.

7. Mmadụ ruru pasentị iri anọ na asaa bi na mba US kwuru na ha agaghị ebili ma ha na ekwentị ha anọghị.

8. Mmadụ ruru pasentị iri anọ na asaa n'ụwa niile kwuru na ha eji ekwentị ha ma ha achọghị mmekọ mmadụ ọbụla.

9. Ndị mmadụ karịa n'afọ 2015 site na ise foto onwe nke a na-akpọ selfie.

10. N'ime mmadụ ijeri asaa bị n'elu ụwa, nanị mmadụ nde atọ na puku nari ise (3.5m) nwere ihe e ji asa eze mana mmadụ nde anọ (4M) nwere ekwentị.