Ndị Taliban egbuola mmadụ 95 na Afghanistan

Onye meruru ahụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwere ike itinye dịka ndị nyocha siri kwuo

Otu onye ogbunigwe mgbagbuonwe egbuola ihe ruru mmadụ iri itoolu na ise ebe ihe karịrị otu narị na iri ise na asatọ ndị ọzọ meruru ahụ n'agha ndị Taliban buru n'etiti isi obodo Afghan bụ Kabul dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu si kwuo.

Ndị mere ihe a bu ụgbọalaozu ha kpojuru ngwoagha ogbunigwe gafe ebe ndị uwe ojii na-enyocha ụgbọala banye otu ụzọ ebe nanị ndị ọrụ gọọmentị na-aga.

Ihe a mere n'akụkọ otu ụlọ mịnịstrị gọọmentị etiti Afghan mere ochie dịkwa n'akụkụ ụlọ ọrụ ndị otu EU.

Ndị Taliban ekwuola na ha buru agha ahụ nke kachasị njọ n'ọnwa gara aga.

N'otu izuụka gara aga, ndị Taliban gburu mmadụ iri abụọ na abụọ n'ụlọ nkwari dị na Kabul.

Ndị hụrụ ka ihe a mere kwuru na ọtụtụ ndị mmaọ̄ụ kachasị ndị bịara abịa nọ n'ebe ahụ tupu ogbunigwe ahụ agba taa.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu kwuru na ndị mmadụ nwekwara ike ịnwụ ọzọ dịka a ka na-ebute ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọọgwụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara