Leicester abanyela agba nke ise n'iko FA

Ndị Leicester Image copyright Leicester Twitter
Nkenke aha onyonyo Leicester City ejirila mmeri a gafe agba nke ise na asọmpi a

Leicester abanyela agba nke ise n'asọmpi iko FA dịka ha ji ọkpụ Kelechi Iheanacho na onye ọhụrụ Fousseni Diabate nyere gafe Peterborough.

Diabate bụ onye esị na klọb ndị France bụ Gazelec Ajaccio kpọta kpaara bọlụ sị akụkụ kọna ya na Iheanacho nye golụ nke mere ka ha bụ ndị obia nọrọ n'elu asọmpia ahụ.

Nwafọ Igbo bụ Iheanacho gbaburu Manchester City were isi tinye ya bụ bọlụ Christain Fuch's gbara ịmezu ya ọkpụ atọ ha ji mere mgbe a gara ezumike nke ọkara oge.

Ndị Peterborough satara otu golu mgbe alatara ezumike nke Andrew Hughes nyeere ha, mana Diabate na Wilfred Ndidi gbakanyekwara golu ọzọ tupu egbuchia ya bụ egwu bọlụ, nke ha jị mezuo ya ọkpụ ise charaacha.