Ndị uweojii na Colombia etinyela $18000 iji nwuchie ndị wakporo ụlọ ha

ụlọ uweojii na Barranquilla Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Mmadụ iri anọ meruru ahu na nwakpo mere na ọlụ ndị uweojii

Ndị uweojii na Colombia si na ha ga enye onye ọbụla nyere ha atụmatụ maka ogunigwe gburu mmadụ ise na ọlụ uweojii dị na nnukwu obodo a na-akpọ Barranquilla na ugwu mba ahụ dollar puku iri na asatọ.

Ihe ruru mmadụ iri anọ merụrụ ahụ mgbe ogbunigwe ahụ gbara.

Ndị ọdachị a metụtara bu ndị uweojii na agbakọ na ọnụ ụtụtụ na ahazi otu ha ga eji ga ngaghari nchekwa.

Onye na achi Barranquilla, Alejandro Char si na ya kwenyere na ọ ndị na ebu ọgwụ ike kpara ike a maka mbụso agha ndị uweojii na ebụso ha.

Ọgbụgba ogbụnigwe a bụ nke kachasi na mwakpo emere ndị uweojii na nso maka me na obodo so na ndị kachasị mkpa na Colombia.

Ihe a mere ka obodo ahụ da jii, ma metutakwa nkwadọ a na eme maka nnukwu oriri ana eme kwa afọ na ya bụ obodo.

Isiokwu Ndị Emetụtara