Ndị uweojii si na ha agbapụtala ndị mba Sout Afrịrịka ndị ntọọrị ji

Ndị uweojii Naịjirịọ́ Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ntọọrị na akpa ike na Naịjirịa

Ndị uweojii Naịjirịa si na ha agbapụtala ndị mba Sawt Afịrịka abụọ ndị ntọọrị nwụchịkọrọ na mpaghara Kaduna steeti a na-akpọ Maidaro, bụ ebe ama maka ịgwupụta okwute bara uru.

Ozi onye na ekwuchitere ndị uwe ojii zipụrụ na akọwa na ha ji ndị uweojii pụrụ iche ji zọpụta ndị a eji.

Ndị a zọpụtara bụ Mazi Arnold Pearce na Mazi Hendrik Gideon a nwụchikọrọ na Januwari 23 na Maidaro.

Ndị uweojii si na ahụ di ha mma, na onweghị ihe mere ha.

Mana, ndị uweojii ekwughị ma onwere ego akwụrụ ji gbapụta ndị a eji.

Ihe a na eme ka ozubeghị izu ụka agbapụtala ndị Amerịka abụọ na ndị Canada abụọ ndị ntọọrị jidere na ụzọ Abụja.

Ndị ntọọrị na akpa ezigbo ike na Naịjirịa, mana ha du hapụ ndị ha ji ma akwọ ha ụgwọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara