'Ndị a nwuru ji shọvel na-egwu ala' - Ndị uweojii

Police
Nkenke aha onyonyo Ndị uwe oji na nyocha nyabu mberede

Ihe ọdachi mere na Gariki Ugwuoba di n'oji River n'Enugwu steeti ka aja kpochiri mmadụ abụọ ebe ha na ekpo aja.

Nyocha BBC igbo mere gbasara ihe a gosiri na ndị ọrụ ike a ejighi ngwa ọrụ ha kwesiri iji rụọ ọrụ ibọpụta aja n'ala.

Onye na kwuchitere ndị uweojii na Enugu steeti, bụ Ebere Amarizu gwara onye nta akụkọ anyi n'elu ekwenti na ndị a nwuru ji shọvel na-egwu ala. Ọ sikwa na ha "enweghi Pay loader mọọbụ tractor bụ ihe masiri iji gwupụta aja ana ere ere". Ọ si na ọ ihe a bụ ihe butere ihe ọdachị a."

Amarizu kwukwara na iwu ejighị ọrụ ndị a na arụ makana ebe ihe mere bụ "ala obodo ha."

Image copyright 1998 EyeWire, Inc.
Nkenke aha onyonyo Traktọ bụ ngwa ọrụ eji a bọpụta aja n'ala

Mana otu okachamara gbasara ọrụ ịrụ ụlọ bụ Engineer Bolaji Atolana gwara BBC Igbo na gọmeetị kwesiri ịkọwa ọfụma otu ekwesiri ime ha bụ ọrụ ịbọpụta aja n'ala.

"A maghị na ha ga gba mbọ jị ngwa ọrụ tupu a bido oru a ịbọpụta aja n'ala. Ha kwesịrị i ma na ọrụ ka bụ ọrụ di iche dị ize ndu," Atolana gwara BBC Igbo.

Amarizu kweta n'okwu nke a, ma si: "Ndi ogbasara kwesịrị ilebanya na okwu ha, na-eme nkwuzi di ichiche maka ịbọpụta aja n'ala."

Otu nwoke so na egwu aja na ebe a ihe a mere, pụtara.

Isiokwu Ndị Emetụtara