Mmeka ahụ nke ikpere na-echu Henry Onyekuru ụra

Henry Onyekuru Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Henry Onyekuru si Eupen gawa Everton

Onye egwuregwu bọọlụ bụ Henry Onyekuru nke otu Everton ekpebiela na ya ga laghachị otu Anderlecht, nagbayeghi na ya na otu Anderlecht enwebeghi nkwekọrịta ma ọ ga-agawa iwa ahu.

Onyekuru dị afọ ịrị abụọ banyere otu Anderlecht na mbido afọ 2017. O nyekwa goolu ruru ịrị tupu onwe mmeka ahụ n'ikpere.

Anderlecht zichere Onyekuru gawa Everton iwete onweya, mana Everton kpebiri na iwa ahụ Onyekuru na-akwado ime ihe adịghị mkpa.

Ọbụru na Onyekuru mere iwa ahụ nke a, ọ ga-ara ya ahụ ịweta akwụkwọ ịrụ ọrụ n'obodo ahụ.

Ugbua, Onyekuru na-enweta oweya ya na Anderlecht n'iwa ahụ. Ọ na-leanya ịlaghachị Anderlecht maka asọmpị Jupiler league nke na-abịa n'ihu.