Enweghi njikere butere mgbasa ọrịa lasa fiva- NMA

Lassa fever Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Lasa fiva egbuola ọtụtụ mmadụ gunyere ndị ọrụ ahụike

Ndị otu dibia bekee n'ala Naijiria a na-akpọ, NMA, n' aha ịchafụ ekwuola na ọrịa lasa fiva na-agbasa ala Naijiria niile bụ maka na Naijiria enweghi njikere i kwụsị ya bụ ọrịa.

NMA kwukwara na gọọmenti kwesiri ileba anya n'ulọọgwụ niile dị na ala Naijiria inwe ikike ikwusi ọrịa lasa fiva.

Ha rịọkwara ndị mmadụ ka ha ga ụlọọgwụ ozigbo ha hụrụ akara na-egosi onye na-arịa ọrịa lasa fiva dịka iba, isi owiwa, ike ọgwụgwụ, ukwara weredirigaba.

Ha kwukwara na ọ dị mkpa ka mmadụ niile chekwa nri a dịka garri na mkpụrụ dị ichiche n'ime ọgbọ.

Ha gosiri ọmịiko maka ndị niile nwụrụ n'ọria lasa fiva na Naijiria na afọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara