Diafra Sakho bụzi onye egwuregwu ọhụru nke otu Renes

Diafra Sakho Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Diafra Sakho si Metz gawa West Ham

Onye egwuregwu bọọlụ nke mba Senegal bụ Diafra Sakho apụọla na otu West Ham gawa Renes.

Onweghị onye mara ego ejiri zụ Sakho n'aka otu ndị West Ham.

West Ham dere na akụkọ ozi ha na "anyi ekele gị Sakho maka ihe niile ịmere na West Ham. Ka ogazire gi nke ọma n'ihe niile ị na eme n'odịnihu gị"

Sakho nọrọ na West Ham afọ ịrị na okara.

Na oge ya na West Ham, Sakho nyere goole ruru ịrị abụọ na anọ n'ime asọmpị ịrị asaa na otu.

Mmeka ahụ dị ichiche bụ ihe nyere Sakho nsogbu.

Echiche ya bụ na ọgụga ya na Renes ga-eme ka o soro na otu egwuregwu nke ala Senegal maka iko mba uwa na-eme na Russia na afọ nke a.

N'akụkọ yịrị ibe ya, akwusiri Arthur Masuaku nke ala Congo ọrụ nike makana ọ bụ onye egwuregwu ibeya asọ na asọmpi iko FA.